Chinua Achebe: Okosisi (Iroko) adaa!

Standard

Okammuta Chinua Achebe

Okammuta Chinua Achebe

Ihe emee! Okosisi adaa!!
Chi e jiri ututu jie!!! O bu onye ka anyi ga akoro?
A si na Okammuta Chinualumogu, ezigbo nwa Achebe anabago?
Anya mmiri juputara m anya. Onwu olee ebe ike gi di?

Chei, Onwu e mee anyi aru!
Chinualumogu; Dike anyi ji eje mba! O ji mkpisisi akwatu mgbidi!!
Onye Ndigbo ji eme onu. Onye umu Africa ji anya isi.
Onye mba uwa na akwanyere ugwu puru iche.
Ihula nu ka ebe niile dere duu?

Akwaa akwuru! Ude gi dezuru mba! Ijele ka ibu.
Chinualumogu; Onye edemede ka ibe ya! Akpa uche!
Ebelebe egbuola, ewooo! A ga m ekwu zi ole hara ibe ya?
Onu na-ekwuru oha! Onye ga-ekwuchiziri umuafo Igbo?

Chinualumogu, ezigbo nwa Achebe. Nwokeoma Chukwu kworochara aka keputa.
Odi uko na mba! Agbogidi! Okaaka odumodu!!!
Ude gi na ndu, ude gi n’onwu. I ka si m kwuo?
I ma na i kuziri anyi ihe e ji mkpisi eme. Ka m dekwuo nw’obere.

Ndigbo ebezina. Nigeria ebezina.
Africa ebezina. Mbauwa ebezina.
Maka na Chinualumogu, ezigbo nwa Achebe anwubeghi.
O ga na-ebi ndu n’ime obi anyi rue mgbe ebighebi.

Nnanyi Okammuta Odenjinji Chinua Achebe jee nke oma.
Biko kelee EzeIgbo Gburugburu. Keleere anyi Owelle Onicha (Zik).
Gwa ha ka imi jiri debee onu na Naijiriya.
Kelee ndi nna nna anyi niile ebe ahu.

Daalu maka otutu akwukwo nke ideputara anyi.
Daalu maka ezigbo ndu nke ibiri n’uwa a.
Anyi ma na I ga-eso dinwenu anyi Jesu Kristi n’agoro anyi ofo oma.
Chineke onye okike, daalu maka ikere anyi ezi nwoke di ka Okammuta Chinualumogu Achebe

Soro m ma o bu zie m ozi na twita – @donlaz4u

Dibiabekee Laz Ude Eze

Dibiabekee Laz Ude Eze

Advertisements

About Laz Ude Eze

A public health physician, health systems consultant and an advocate for good governance, health equity and social justice. Authored the book, "A Companion to Practical Pathology" and founded HAPPYNigeria in 2006. I'm also a Brand Ambassador of Social Good Nigeria. To read my full profile, copy and paste this link on your URL and check it out >> http://www.linkedin.com/profile/view?id=35254652&trk=tab_pro Your feedback on all posts are welcome. Follow me on twitter - @donlaz4u.

8 responses »

  1. I dere nke oma laz,onwu okammuta Achebe wutere nwa amala igbo ni’le nke ukwu. Ka anyi dieya .kee ka I mere?

  2. N’ezie onwu gburu Achebe metutara ndi uwa dum o kasi ndi Igbo ya na Ndi Naijiria! Ka ma na obi dim uto na ighi na Okeosisi a bu okacha nmuta bu Chinualumogu hapuru mkpisi ukwu aka oru yaa n’ elu uwa a

    Dokita Laz, dalu na-edemede a e deputara!

  3. Igbo kwuru okwu si na ihe mere mbe mere oha,onwu ACHEBE metutara oha ma na obi di uto na otutu Achebe digasi ndi ga arutopu oru a okammuta Achebe hapuru no ogbo a. Anom ekele Mazi Laz Udeze,nwammadi puru iche. Igbo jikwazi eme onu

Leave a Reply

Fill in your details below or click an icon to log in:

WordPress.com Logo

You are commenting using your WordPress.com account. Log Out / Change )

Twitter picture

You are commenting using your Twitter account. Log Out / Change )

Facebook photo

You are commenting using your Facebook account. Log Out / Change )

Google+ photo

You are commenting using your Google+ account. Log Out / Change )

Connecting to %s